Responsive Adsense

Thank you for visiting. In honour of the 5th anniversary of Uwakwe Reflections, we have relocated to a bigger platform at www.uwakwereflections.org. Do meet us there.

Monday 14 March 2016

Holy Thursday Commentary in Igbo Language

Ndi b’anyi otito diri nu Jeso Kristi…

Umunne m na umunna m, ndi nze na ozo, ndi ichie, ndi eze, ndi gburu agu na ndi n’egbughi, umuaka, umuagboghobia, umuikorobia, ndi nne na ndi nna anyi nnoo-nu-oh!

Onye anwuna ma ibe ya efuna; onye mara nke ochiri ya zaba; onye mara nke ana etu ya, ya zaa.

Na atufughi oge, n’ihi na o na-abu ekwe kuo ama agbaa. Oge nri ehihie ruo, onye usa apuo oriri. O bu nani uzo di mma ka ana eje ugboro abuo. Maka ndi uche ha echetaghi, ndi biara na ndi uzo biara, tata bu TOOZIDEEH di aso, Ubochi Dinwenu Jeso Kristi guzobere Sakramenti nke Yukaristia di Aso na Sakramenti nke odaasi di aso, bu nke eji echi ndi Ukochukwu. N’ubochi taa kwa ka ogosiputara ihunaya n’ebe umu azu ya no site na isa ha ukwu.

Onye buru chi ya uzo, ogbagbuo onwe ya n’oso. Agam n’akowaputara unu otu emume tata siri di; ya bu onye obula wusa ahu; maka o na abu aka kpara ngaji, afo na onu ana eme, amuma see atuba anya egbe igwe.

Ebe obu n’ezuola ka aha-eri udele, a gam atotuzi ngi-ga ngwa ngwa, maka na onye onye-ara nyere ala, na ako ya ihe osiso, ka oga-abu isi di ya mma o naba ala ya, echeregodu ka onye koro ihe were ihe ala miputara; m obughi out a ala ahu ala a ya n’iyi.

Ma tupu mu amalite, ka m jukene unu; ebe obu na onye ajuju anaghi efu uzo. O bu gini tinyere ugiri mmanu? O bu gini mere anyi nile ji gbakoo ebe a tata? O bu eziokwu na ngwugwu a ga atupe atupe odighi mma itu ya mbo; maka na eriri ejiri kee ngwugwu toghee, ngwugwu na onwe ya atoghee. Ma ebe o bu na onye na anoghi ebe eliri ozu n’esi n’ukwu abo ya; onye a maghi mmadu na-akpo ya onye a. Ebe o bukwazi na ánà eburu-godu uzo hu ihu nwata tupu abaa ya aha m’obu nara ya ihe oji na aka. O ga adi mma igwazi unu ya bu ihe n’uju maka mgbada chi umu anaghi agba oso eleghi anya n’azu. O buru na atughi aro gaa nta, egbuo anu n’enweghi aha.      
Igbo bu Igbo, ka mgbe izu uka ise gara-aga ka anyi no n’ime oge ahuhu, n’eru uju, na eche oge Dinwenu anyi Jeso Kristi ji wee taa afufu n’elu obe maka mu na gi ndi njo; na agbanyeghi ibu Chukwu o bu.

O mere nke a iji sachaa anyi na njo ma chetakwara anyi na onye koro ubi anaghi ahapu ubi ya maka na oruru ahihia; na okenye ekwesighi ino n’ulo ewu amuo n’ogbili. N’aka nke ozo obuzi anyi k’odiri imezi ndu anyi, maka na onye chi ya n’azo n’azo onwe ya ka anyi chetakwa na anyi na onye iron anyi bu ekwensu no n’agha oge nile.

O bu njo n’ekewapu anyi n’ebe chukwu no; mana kama njo ga eri isi m, ya kpuru okpu m kpu n’isi.

Umunne m na Umunna m otu a ka emume anyi g’esi di:

NKE MBU:         EMUME NKE OKWU: O gunyere ihe ogugu nke mbu, nke abuo na Ozioma. Nke a gachaa, Ukochukwu na achu aja g’adobinye anyi okwu chukwu.

NKE ABUO: EMUME NKE ISA UKWU: Nke a gachasia o buru EKPERE NKE NDI KWERENU.

O ga asokwa m igwa unu na agaghi ekpe ma o bu kwee “EKWE M N’OTU CHINEKE” n’uka tata. Ekpere ndi kwerenu gachasia o buru oge onyinye. Nke a gachasia o buru emume nke Yukaristia. Nke a gachasia oburu isi na Altar buga oriri di aso na ALTAR OF REPOSE, ya bu ebe ozuzu ike maka na oge eruola mgbe ndi juu jiri chosiwe ike ka ha gbuo Jeso.

Ndi b’anyi, n’ime oge izu uka ise a, anyi no na Lenti, anyi anaghi ekwe OTITO DIRI CHINEKE N’ELU KACHA ELU, ma tata, anyi ga-ekwe ya. Áná ekwe ya, a aga na aku mgbirimgba (atañu)/Bell ganye n’ekwechaa ya; iji gosi ihe omimi di na abali tata. 

Emechaa nke a, agaghi aku ya bu mgbirimgba ozo wee ruo abali ubochi Saturday di aso bu ubochi Kristi g’esi n’onwu bulie; bu oge aga akuziri anyi ekwe maka na ekwe kuo ama agbaa. K’anyi chetakwa na obu naani ugboro abuo ka ekwe na-akpo dike. O kpoo ya na ndu, okpoo ya n’onwu.

Ya bu ndi otu Kristi ibe m, ana m ario na ariosi unu ike, ka onye obula meghee anya ma meghepukwa nti ya sonye n’uju n’ihe nile a na eme tata, wee keta oke zuru ezu; ghara idi ka onye nzuzu gara n’izu puta juwa ihe agbatara n’izu.

O jogburu udele na njo ma sigbuo nkakwu na anyi g’anoro mmadu mmadu n’esi mmuo mmuo. Okwesighi ka mmadu noro na mmiri ncha abaa ya anya. K’anyi chetakwa na anaghi ano n’ahia atu ahia; o bu onye n’anoghi ya ka ana agupuru ji n’oku.

N’ezie, o na abu ihe kwuru, ihe akwudebe ya. Ya bu k’anyi meghepu nti anyi, ma onye emekwana nke ya k’odi ka nke okpu-ata, maka na nti n’anu ihe abughi ma oha ka okpu-ata. Ekene kwaam unu ozo; ka m bia abughi igba oso a gam ano nso igwa unu ihe obula oge ya ruru.

EMUME NKE OKWU

Ugbua, Ukochukwu g’edu anyi n’ekpere iji malite emume a. Omechaa nke a anyi nile anodi ala maka ihe ogugu.

IHE OGUGU NKE MBU Exodus. 12:1-8,11-14 (Confirm the recommended reading for the liturgical year)

O bu nnani ndi nwere imi na-akpo utaba. Nnani ndi ukwu di, n’acho (size) akpukpukwu g’aba ha n’ahia akpukpukwu. K’anyi chetakwa n’obu naani ndi nwere eze n’ata oka kporo nku. Onye nna ya zigara ohi n’eji ukwu agbawa uzo. N’ihe ogugu a, chukwu gwara Moses na Aaron na ha g’esi na obodo Egypt wee kpoputa umu Israel, wee kpobaa ha n’ala O kwere ha na nkwa. Ozokwasi, tata g’aburu ha ubochi ncheta oriri n’aha Dinwenu maka na o bu naani ndi bu akwaakwuru n’ezi omume g’eso gbagoo n’ugwu nke Dinwenu. Chetakwanu n’obu naani Dibia n’aga n’ihu arusi n’eyiri aworo mmuo.

IHE OGUGU NKE ABUO: 1 Cor. 11:23-26.
N’eziokwu a na esi na mmiri eji akwo aka ama ka nri aga eri ha. A na esikwa n’isi áhù ama uto nsi. Ejim na aka n’unu mara na a na esi na ntutu ukwa ama onye na abu ubu nri. Okpa ngà ngà biko kpaa ya n’ime Chineke maka nzoputa nke mmadu. Chukwu anaghi echezo onye okere, obioma Chukwu enweghi ube. Oriri aburughi onu ihe nkafie. Bia rie abughi bia ruo. O na abu mmanu baa n’afo, uka ebido bawa na nti. Maka na onye aguu na-agu anaghi ege akuko.

N’ihe ogugua, Pol di aso n’agwa anyi otu Jeso Kristi siri were ahu na obara ya zuo ndi nke ya nri ma tiziere ha iwu ka ha n’eme ya na ncheta nke ya. Maka na ana ebo nwata ihe k’isi ya ha.  

OZIOMA:  JN. 13:1-15

Nnekwu okuku siri n’obughi ihere maka ihe oke okpa n’eme ya n’ihu oha na eze n’ewute ya, kama o bu okpo nile o na aku ya n’isi n’ihu oha. N’eziokwu onye obi abuo anaghi egbunwu agu. O bu naani onye ndidi na onye obi umeala n’eri azu ukpoo. Nkita ji obi umeala eso onye afo toro n’enweta ihe oriri. Onye butuo onwe ya ala Chukwu ebulie ya elu.

N’ozioma, Jon di aso g’akoro anyi otu Jeso Kristi siri wee gosiputa ndi umuazu ya na onye bu nna ukwu n’etiti ha ga-abu odibo ndi ozo. O mere nke a site n’iyipu uwe ya were mmiri sachaa ma fichaa ukwu umuazu ya.

BEFORE THE HOMILY

Umunnem na umunnam, biko nu, okwa unu mara n’ijiji n’enweghi onye ndumodu n’eso ozu ala n’iyi. Ekwuoro nti ma onughi ebere isi nti esowe ya. Nsiko siri na ihe ya jiri nwee ihu abuo bu na chi ya na ndi ogo ya nwere ike irio ya oru otu oge. Ya bu, amaaram na nti abuo anyi nwere abughi ihe eji acho mma.

Chetakwanu na anaghi anapu Dike mma oji n’aka, kama ihe a na agwa ya bu ya egbula ochu. O na adi mma ana ako maka nkapi ka a kpoo ya onu mpi mpi maka o mee chee n’obu oke k’ana ako maka ya. Onye n’egosi nwata awo n’ikpo okwute ya biko tuoro ya aka iji gosi ya nke bu awo maka na odi mma anwuta nkita akpiri si gosi ya maka adighi amá ama  onitsha gwara obosi.
Ugbua Ukochukwu ga agwa anyi okwuchukwu, n’ihi na o na adi mma a tuo ilu si kowaa ya.  Ka o na eme nke a, anyi ana ege nti maka na nwanyi bu ibe ya uzo sibe nri n’ebukwa ha uzo enwe nkpo nkpo ite.

ISA UKWU

Ndi b’anyi agha akara-aka anaghi eri nwa ngwuro. Chetakwanu n’uka akpara-akpa n’eji isi ekwe ya. N’ihi nke a kporokpoto ga-agbazi n’ihu enyi, maka na o bu okuko isi kara-aka na eje ogu oturukpokpo.

Ihe oge ya ruru abughi usa. Onye siri nwata jide nkapi g’ekunyekwa ya mmiri o ga eji kwuo aka. Ihe oma ohu si n’aka ndi umuazu wee ruo anyi aka bu ihe ukochukwu anyi g’egosiputa kitaa; maka na agadi nwanyi anaghi aka nka n’egwu o mara agba.

Umu Chineke ibem, ejighi oku ekiri ehi. Nwata gwa gi na idi isi ka ewu, mara na nna ya gburu ewu. Eziokwu, onye bulie onwe ya elu, e budaa ya, ma onye budara onwe ya ebulie ya elu.

N’egbughi oge obula, tupu oka di na ekpem (bottle) agbaa Okuko ghari a na m akpo umunne anyi ndi aga asa ukwu ka ha putawa.

Mgbe a na asa ya bu ukwu, ndi “Choir” ga na asuru anyi ukwe. Onye obula g’etinyekwuazi onu maka na Igwe b’ike; onye aghana nwanne ya. imaghi ekwe kwebe n’isi maka aturu siri n’eburu egwu bata n’ama nna ya, ya amaghi agbaa ya awulibe elu; ma ya amaghi awuli elu, ya ekwebe n’isi. Chetenu na nnunnu  n’ekwe n’isi nwere ihe n’akuru egwu.

EKPERE NKE NDI KWERENU

Ndi b’anyi obuzi ekpere nke ndi kwerenu ka anyi nwere ugbua. Ya bu k’anyi were nu otu obi na otu olu dika ezinulo huru onwe ha n’anya bekuo ose-buruwa ma riokwaa ya ihe anyi bu n’obi, maka na osiri anyi rio n’anyi g’oriota, anyi kuo aka na-aga emeghere anyi anyi uzo.

Chetakwanu na agwo otu onye huru n’aghoro ya eke; ma ntasi obi anyi bu na nne anyi bu Virgin Maria g’eburu aririo anyi bugara Chukwu.

OFFERTORY (O.C.)

Onye ji azu ria ugwu jirikwa azu ridata, o di ndu ya kele chi ya. O na abu aka nri kwuo aka ekpe, aka ekpe akwuo aka nri.
Ihe anyi nwere kita bu oge onyinye (O.C. = Onyinye Chineke n’igbo; Offertory  Collection).
Puta kitaa bia kelee chukwu maka na ume I na eku si n’aka ya wee bia. O kwa etoo Dike na nke O mere omee ozo.

IGOZI ORIRI DI ASO
Igbo b’Igbo, anwu tibe, ndi ihe diiri mma apuba oriri. Chi anaghi efocha ghara ututu.
Anyi g’emezi nu ihe ahu Dinwenu gwara anyi mebe na ncheta nke ya. Ugbu a anyi g’abanye m oge odido di aso.

INATA ORIRI NSO
Ndi b’anyi, oriri adanuo! Oriri adanuo!! Nri nke ndi muo oma ka chukwu nyere mmadu nkiti.
Chetakwanu n’obu so naani nwata kwuochara aka n’eso ogaranya aracha piom; naani anu oke oso n’apu oriri ehihie; tinyekwara n’obu anu eze ya di nko n’atu onu n’ala okwute.
Ya bu, obu naani ndi kwadobere onwe ha nke oma g’abia nara ya bu oriri nso.
IBUGA ORIRI NSO N’EKWU AJA OZUZU IKE
(ALTER OF REPOSE)
Ndi Oma n’ege nti, O na abu anyanwu putaba O di ka ubochi buru ututu ututu.
A na-ata O na ato uto O dika ihe ana ata agwula agwu. Okuko jiri si na nnaba ya nabara abughi na afo ejula ya kama n’obu ka ya kwanyere anyasi ugwu diiri ya, maka na eriwe ihe ka O siri ato eriwaa afo.
K’Osina di, Dike mee ihe O ji aza Dike, ihu adi ya n’uzo ula. Ike gwuru alawa oru abughi na oru agwula. Mmanwu nwaa oko ya O laa. Erichaa nri ekpuchie Oku.
Ihe m n’ekwu bu na emume anyi n’abiazi na njedebe. Ma chetakwanu na anyi ga eche nche o bunagodu naani otu awa.
Anyi a gaghi ejicha iru uju wee chee nche anyi maka na nku gwuru n’ulo abughi n’osisi agwula n’ohia. Na chi jiri abughi na ubochi agwula. Olile anya ka di.
Ugbua a ga ebugazi oriri nso n’ekwu aja ozuzu ike. Ukochukwu ga eme nkea ma okpechaa ekpere ma fekwaa Eucharistia di aso anwuru oku Insensi.
Ka ya na ndi n’agba odibo n’aga na Altar of Repose, anyi ga na ekwe “pange Lingua gloriosi…” Ha ruo ebe ahu anyi ebidozia “Tantum Ergo…”

MMECHI

Biko O na abu anyuchaa nsi ma atupughi onu O buru otoro. N’ezie, mmuo kwere ekwe ma na anu ahu esighi ike. Jeso gwara umuazu ya banyere afufu nke o ga ata, mana okweghi ha nghota maka na ihe okenye mmadu noturu ala wee hu, osogodu nwata rigoro elu osisi órjì ogaghi ahu ya. Jeso no na uru nke obi maka njo ndi nke ya. O gwakwara ha ka ha soro ya muru anya ma chee nche O burugodu otu awa (hr) mana ura juputara ha na anya maka na o na abu eburu ozu nwa mgbeke o dika o bu ukwu nku  k’ebu.

N’eziokwu nwata akwo n’azu amaghi n’ije di anya. Mana ebe obu na otee aka oji diba njo odiba mma; ebe obu na onye ndidi n’eri azu ukpoo. O bu naani mkpuru osisi dara n’ala rekwaa ure g’epu ma mita mkpuru.

Onye kwe, chi ya ekwe. Ya bu umunnem na umunnam o buru n’ihuru Jeso n’anya gezia nti k’imara ka aga esi wee chee ya bu nche.

Credit: Felix Aguka,  edited by Chibuike Uwakwe

No comments:

Post a Comment

DISCLAIMER: Comments, remarks and observations are allowed to enable my readers freely express their opinions concerning issues raised in this post. However, while I recommend the observance of the rule of courtesy for every comment, comments on this post do not in any way express my personal opinion. They are strictly the opinions of those who made the comments.

Print Friendly