Umunnem na Christi, ana-asi n’ezuo etu esi eri udele
amiba ngiga. Odimma diri nnukwu mkpa n’anyi nile no ebea ibido emume abali Satode
di aso nunwa maka na onye anoghi egbe eliri ozu na-esi n’ukwu avo ya. Ndi uka Katolic
nwere nnukwu ugwu na nsopuru puru iche ebe emume abalia di maka na-ewezuga mbilite
n’onwu Jesu Kristi, okwukwe ndi Katolic abaghi uru.
Nnoko anyi n’abalia ga-eweta otutu ihe n’isi njedebe.
- Satode
di aso na-eweta emume Lent n’isi njedebe
- Ona-eweta
izuuka di aso n’isi njedebe
- Ona-eweta
emume Triduum n’isi njedebe;
- Satode
di aso nakwa eweta n’ime obi anyi anuri mbilite n’onwu nke Dinwenu anyi bu Jesu
Kristi.