Responsive Adsense

Thank you for visiting. In honour of the 5th anniversary of Uwakwe Reflections, we have relocated to a bigger platform at www.uwakwereflections.org. Do meet us there.

Monday 14 March 2016

Commentary on Palm/Passion Sunday in Igbo Language

Ndi b’anyi, ekele m unu.
Ekwe kuo ama agbaa. Ezuo ka aha eri eze mgbada atotuo ngiga. A nam asi onye obula n’ime unu nnoo n’nnukwu emume nka tata.
Emume anyi tata abughi egwu achi utaba n’aka agba, ma obu egwu nkita. O bu nnukwu emume puru iche nke ndi otu Kristi. N’ikwu ya na mgbawa eze, uka na-eme ncheta obuba Kristi ji mmeri wee baa na Jerusalem.
Ugbua, O di mkpa na anyi ga ege nti nke oma, wee ghota ihe nriba ama digasi n’emume anyi tata. Maka n’onye anoghi ebe eliri ozu n’esi n’ukwu abu ya. Tinyekwara na oburu n’atughi aro wee gaba nta, e gbuo anu enweghi aha.

Emume tata na-eche n’ihu anyi, ihe mere dika puku aro abuo na asaa gara aga.
Emume a agaghi amita mmimi n’ime anyi ma oburu n’anyi ewebataghi ya na ndu anyi. O bu taa ka Jeso mejupatara ihe onye amuma Zacharia mara na-amuma;
“Rejoice heart and soul daughters of Zion, shout for joy daughters of Jerusalem; look your king is approaching. He is humble, victorious and riding on a donkey, and on a colt, the foal of a beast of burden (Zach 9.9).
 N’ iga n’ihu, ihe ogugu izu uka gara-aga na-agwa anyi maka nkata ndi juu na-akpa ka ha jide Jeso wee gbuo ya. N’ihi nke a, Jeso zochiri onwe ya ka ha hapu ijide ya ganye na oge akara aka eruo. Omara nke oma na ukpana okpoko gburu na nti chiri ya.
Uka, n’aka nke ya, na mbo iji gosiputa ihe a, ewerela akwa kpuchie obe nile. Oweputakwaziri n’ihu anyi tata obuba Jeso bara Jerusalem na-mmeri. Nke a abughizi dika onye nkuzi, otu o si eme na mbu, mba! O bu dika Eze; Eze kacha Eze nile, dike n’agha.
O doro anyi anya na obibia ya n’uwa bu ka O gbaputa ndi nke chukwu, ka O nara afufu ma banyekwa na otito ya. Ya bu na emume anyi tata bu mma ihu abuo: Otu juputara na anuri maka na Jeso bu eze. Nke ozo juputa na uru maka na Jeso, eze anyi na eje inwu onwu; onwu ihere.
Umunne m, anyi agaghi ahu cha nke Ikpetemazu a dika ihe uru. Ka anyi lota ihe Pol di aso gwara anyi: “Unu ebebigana akwa oke dika ndi n’enweghi olile anya”.
Nke a bu maka na onwu Jeso ga-anwu bu maka nzoputa anyi. Ya mere, mgbako anyi gbakoro ebe a n’ututu a jiri buru isonye Jeso na mmeri ya; maka na oburu na Jeso onye isi nzuko bu Eze ma banyekwa na otito, anyi onwe anyi dika umu eze ga-esokwa keta oke n’eze o bu. Ya bu, dika anyi na ya bu otu, o gaghi abu anyi tisie Hosanna diri nwa nke David; anyi esonyekwa tiwe kpogbuo ya.
Uka omu abukabeghi ubochi anyi n’eji omu aga uka dika otutu n’ime anyi siri ghota, kama o bu ubochi ndi otu Kristi no n’akuku uwa nile, n’uzo puru iche na esonye, person nke abuo n’ime ito n’otu di ngozi, ya bu Jeso Kristi, Chukwu nwa emere mmadu, were na-anuri maka mmeri ya, n’obi anuri na-eti mkpu na-asi:
“Hosanna Filio David: benedictus Oui Venit in nomine Domini, Reu Israel; Hosanna in eucelsis”. (Mtt. 21.9).
Nke putara: Hosanna diri nwa nke David, o di ngozi bu onye biara n’aha Dinwenu, Eze ndi Israel; ebube na otito diri ya n’elu kacha elu.
Tata dika aha ya siri di “Passion Sunday” bu mbido izu uka di aso, izu uka amara, oge anyi na-eme ncheta afufu na onwu Jeso n’obe, “the infamous gibbet”, oge Kirsti gbafuru obara ya di oke onu maka nzoputa nke mmadu n’agbu nke njo na onwu ebebe.
Ekere emume anyi tata uzo abuo: Agba nke mbu na agba nke abuo. Agba nke mbu bu Ncheta obuba Dinwenu anyi bara Jerusalem nke ndi bekee n’akpo “Commemoration of our Lord’s entry into Jerusalem”
Agba nke abuo bu missa di aso nke anyi ga-ano na ya cheta ahuhu dinwenu anyi Jesus Kristi.
N’agba nke mbu enwere:
(1)     I gozi omu
(2)     I ba n’ulo uka
Ndi b’anyi anwuru nchi di ndu n’aka chuba mgbada, nke a nwu n’aka agbafuo. Ngwugwu aga ato ato o baghi uru imu ya mbo.
Agam ano nso igwa unu ihe obula oge ya ruru.
PART ONE (AGBA NKE MBU)
COMMEMORATION OF THE ENTRY OF OUR LORD INTO JERUSALEM.
Ukochukwu ga-agwa anyi okwu ugbua iji meghee obi anyi maka emume tata ka o ghara ibu na anyi biara na ndi ozo biara, kama ka anyi tinye onwe anyi nile.
IGOZI OMU
N’ala Igbo, omu na-egosiputa udo na ihe di nso. Kristi di aso ma burukwa  eze nke udo.
Ukochukwu ga agozi omu ndia anyi ji gasi na aka, iji mee ka ha di aso iji wee too Kristi.
Nke a gachaa, o ga aguputara anyi etu Kristi siri banye na mmeri na Jerusalem dika Luke siri dee ya (Year C) NB: Confirm the recommended text for the liturgical year)
AFTER THE INTRODUCTION BY THE PRIEST
Luke di aso na-egosiputa udi eze Kristi bu. O bu eze nke udo, eze di umeani na-kwa eze nke uwa nile. Maka na ahu di mkpa ahu ogologo imi ya. Dimkpa tie aki ahu ichere ya. Tinyekwara na mba ji na akari ihu n’oku.
IBA N’ULO UKA
Ndi b’anyi ebugharia efere nri, anoghari onodu. Oge nri ehihie ruo. Onye usa apuo oriri.
Ugbua, anyi ga agabazi n’ulo uka n’udi inomi igwe mmadu ahu soro Kristi.
Otua ka aga esi gaa  (Order of procession)
(1)     Thurifer
(2)     Cross bearer & Light bearers
(3)     Priests and other ministers
(4)     Congregation      
PART TWO (AGBA NKE ABUO)
MISSA DI ASO
Anyi abanye gonu na agba nke abuo ugbua, ukochukwu ga-ekpe ekpere mbido (collect); okpesie anyi anotuo ala maka ihe ogugu; uka agabazia n’ihu dika ona di bu.
IHE OGUGU NKE MBU  Is. 50: 4-7
(YR. A, B &C)
Onye amuma, Isaiah na-eme ka anyi mara na Chukwu enyego anyi onyinye ibu nwa azu, na o gaghi ahapu anyi mgbe ihe n’esiri anyi ike; maka na onye siri nwata jide nkapi g’ekunye ya mmiri o ga eji kwuo aka.
IHE OGUGU NKE ABUO Philipians 2:6 -11
(YR. A, B & C)
Onye fee eze, eze eruo ya. Nwata kwochaa aka osoro ogaranya rie ihe. Onye budara onwe ya ala ka aga ebuli elu.
Kristi, n’agbanyeghi n’obu chukwu, wedara onwe ya ala, were onodu mmadu, biakwa rube isi ganye na-onwu n’elu obe. Ya mere chukwu ji nye ya aha kachasi aha nile.
OZIOMA – PASSION Lk. 22:14-23:56
YR. C
Luke di aso ga akowaputara anyi njide, amam ikpe, uru, afufu, mkpodo n’obe, onwu na mbilite na-onwu Kristi.
NB: After the Passion comes the homily before the profession of faith
CREDO
Anyi g’ekwputazi okwukwe anyi ugbua.
OFFERTORY
Kita bu oge O.C. – Onyinye Chineke. N’Olu bekee oburu “Offertory Collection”.
COMMUNION
Nwata kwochaa aka, osoro ogaranya rie ihe. Ugba a bu oge oriri di aso ma obu sooso ndi kwadoro onwe ha ga abia nata ya.
MMECHI
Igbo bu igbo ntutu ntutu ka eji atutu ju akpa. Ugbua anyi na abazi na ngwucha emume anyi tata. Anyi ga elota na obiara ije nwe una. Mana anyuchaa nsi ma atupughi ya onu obulu otolo.
Ya mere tupu ukochukwu asi anyi nabanu ka anyi tinyekwuo nke a na-akpa anyi tupu anyi amachie ya onu.
Ka anyi were omu a agoziri agozi dika sacramentals, ruo ya n’udi cross ma dobe ya n’elu uzo digasi n’ulo anyi m’obu n’azu crucifix. Ka ha buru akara ga na-echetere anyi na anyi ga abanye n’eligwe, ma oburu na ndu anyi nile n’anyi gbara Kristi odibo ma dobe zuo nkwa nke baptism anyi.
NB: Announce the time for the Easter Triduum Ceremonies
Credit: Felix Aguka but edited by Chibuike Uwakwe

No comments:

Post a Comment

DISCLAIMER: Comments, remarks and observations are allowed to enable my readers freely express their opinions concerning issues raised in this post. However, while I recommend the observance of the rule of courtesy for every comment, comments on this post do not in any way express my personal opinion. They are strictly the opinions of those who made the comments.

Print Friendly