Responsive Adsense

Thank you for visiting. In honour of the 5th anniversary of Uwakwe Reflections, we have relocated to a bigger platform at www.uwakwereflections.org. Do meet us there.

Wednesday 9 March 2016

Catholic Commentary for Holy Saturday/Easter Vigil Mass in Igbo



EASTER VIGIL COMMENTARY
(To be rendered outside the Church Before the Ceremony of Light)
Ndi b’anyi, ekele m unu.
Otito dirinu Jeso…
Ihe onye chiri ya zaa.
Egbe bere ugo bere nke si ibe ya ebela…
Ekwe kuo ama agbaa.
Ezuo ka aha eri eze mgbada atotuo ngiga.
A na m asi onye obula n’ime unu nnoo n’nnukwu emume nke abali taa.
Anyi abiakwa ozo tata. N’ezie ihe churu nwata ura di ya oke mkpa. Ohia ogwu mara okuko anaghi aba ya aba; kama, uzo di mma aga ya ugboro abuo. O bu emume abalia g’eweta emume Triduum anyi n’isi njedebe; ndi uzo ulo siri na ihe foduru otu agwula agwu. N’ezie otutu okwu anaghi adi n’uka mgbede.

N’ikwu ya na mgbawa eze, uka na-eche nche maka emume mbilite n’onwu nke Onyenweanyi Jesu Kristi. O bu abali kacha abali nile! Emume nke abali a abughi emume eji ebido emume mbilite n’onwu Kristi nke o na abu emume eji akwado maka Easter, kama o bu emume nke Easter na onwe ya. Taa bu Abali ahu di Nso mgbe Jesu Kristi jiri ebube wee bilite n’onwu.
N’oge Easter mbu, n’anya ndi mmadu, Kristi bu onye daara n’ura nke onwu ebebe ebebe. Ndi umuazu ya jikwara nnukwu egwu nodi n’iru uju nke onwu nna ha ukwu. Ha di ka ndi agha akujisiri ukwu na aka. Ncheta nke okwu oma nile Jesu gwara ha, nkwa nile o kwere ha, na oru itunanya nile nke o ruru n’etiti ha ma n’ihu ha di ha ka nro.
Dika anyi gutara n’akwukwo nso, ndi Juu mere ihe nile ha nwere ike ime iji gbochie mbilite n’onwu Kristi. Ha were ndi agha Rom gbaa ili Jesu gburugburu, bia werekwa nnukwu okwute mechie ili Jesu. N’agbanyeghi ihe ndia nile, mgbe oge a akara aka ruru, Jesu jiri ebube wee bilite n’onwu maka na agha akara aka anaghi eri nwa ngworo. Ya mere n’abali taa, Nzuko na eme ncheta mmeri nke Dinwenu anyi Jesu Kristi meriri onwu. O bu abali ndi otu Kristi nile na uwa nile ji enwe oke anuri. Ya mere ukwe anuri nke aga ekwe n’oge n’adighi anya ga akpoku anyi nile k’anyi soro keta oke n’anuri nke si na mmeri Kristi meriri onwu. Kristi adobiele udo igwe nke onwu, wee si n’ili bilite n’ebube na achi eze. Ngozi diri aha Jesu! Amen.
Ugbua, O di mkpa na anyi ga ege nti nke oma, wee ghota ihe nriba ama digasi n’emume anyi tata. Maka n’onye anoghi ebe eliri ozu n’esi n’ukwu abo ya. Tinyekwara na oburu n’atughi aro wee gaba nta, anu egburu agaghi enwe aha. Ngwanu ka m guputara unu otu emume anyi g’esi di n’abali a maka na ahia ohuu na-agba udele ghari.
E kere emume anyi n’abalia uzo ano.
(a)              EMUME  NKE OKU
(b)              EMUME NKE OKWU
(c)              IME MMIRICHUKWU NA IKWENWO NKWA MMIRICHUKWU ANYI
(d)              EMUME NKE EUCHARISTIA DI ASO
N’emume nke Oku, mmadu nile g’anodi n’ezi, a agbanyuo oku nile n’enwu enwu beluso nke a etinyere n’ihu ulo uka maka emume a. Nke a n’egosi udiri chi jiri eji na ndu anyi; mana chi jiri eji g’abo abo; ihe bia ochichiri agbaa oso; okwute ria elu onye isi nkwocha awara oso. Ihe Kristi bata ochichiri di na ndu anyi ga agba oso.
Mgbe emume nke oku a ga ebido, Ndi ukochukwu ga eyi akwa ocha eji achu aja Misa bata. Onye isi nchu aja kelecha ndi mmadu, o bia gozie nnukwu oku a. O ga esite n’oku a munye nnukwu oriona nke Mbilite n’onwu, nke na egosi uwa nile ihe nke mbilite n’onwu Kristi. Onye Ukochukwu no n’isi emume ga aka akara Greek “alpha na Omega” n’ebe o kara akara nke obe n’ahu oriona a. O ga edeputakwa n’ahu oriona ahu, afa a no n’ime ya. Mgbe o n’eme nkea, o ga ekwuptua na “Kristi bu otu onye ahu unyaghu, taa, na ebebe ebebe – isi mbido na isi njedebe, alpha na omega, o bu ya nwe oge nile, otito na ike nile diri ya ebighebi ebighiebi. Amen. O mecha nkea, o bia dunye mkpuru mgba isi oma ise n’oriona ahu. Nke a na echetara anyi maka onya ise di otito nke Dinwenu anyi Jesu Christi. Mgbe ahu, a ga amalite ahiri (procession) ibanye n’ulo uka. Onye bu mgba isi oma (thurifer) ga ebute uzo, ukochukwu ma obu deacon bu oriona mbilite n’onwu na ndi na agba odibo n’altar bu oriona amunyere oku (candle bearers flanking the deacon) esote. (Mention your unique order of procession) Ndi enyi na umuakwukwo  bido na ndi kacha nta esonye tupu ndi ukochukwu ozo abia n’ikpeazu.
Oriona amunyere oku nke ukochukwu ga eburu banye n’ime ulo uka ga ewepu ochichiri gbachiri ndu anyi. A turu anya na oriona a ga enwu oku n’ulo uka ruo n’ubochi Pentecost. Mgbe onye ukochukwu ga eburu Oriona ahu abata n’ulo uka, o ga ebuli ya elu kwee “Lumen Kristi” nke putara Ihe Kristi, anyi azaa “Deo Gratias” nke putara, “Ekele diri Chukwu”. A ga ekwe nke mbu n’ebe amalitere emume a, nke abuo n’iru onu uzo ulo ula, nke ikpeazu ga abu n’ihu ebe nchu aja. E rute n’onu uzo ulo uka, esi n’oriona mbilite n’onwu munye oriona mmadu nile oku.
Ukochukwu bu oriona mbilite n’onwu biaruo n’ebe nchu aja, o aga adonye ya n’ebe akwadoro ya, onye obula eguzoro oto, ukochukwu abia kwee ukwe anuri nke Pascha a n’akpo “Exultet”. N’ukwe anuri a, a n’akpo eligwe na ala, nzuko na ndi otu Kristi nile k’anyi soro keta oke n’anuri nke na esi na mmeri Kristi meriri Ochichiri. Ukwe a ga akowaputara anyi ka Kristi siri were obara ya gbaputa anyi na onwu ebebe, kwuchitere anyi ugwo njo Adam mere, sachapu njo ndi otu Kristi nile bia kpobata anyi n’okwa grasia na adima nso. O buru na ekwecha nke a, anyi abanye n’agba nke abuo, nke bu emume nke okwu.
INTRODUCTION OF THE READINGS: Dika e si nyem ntuzi aka, anyi nwere ihe ogugu isii nke g’eme k’anyi ghota nke oma isi emume anyi. Ano g’esi na akwukwo agba ochie; otu esite n’akwukwo ozi Paul di aso; nke ikpeazu buzi ozioma.
N’ihe ogugu ndi a, a ga akowaputara anyi otu uwa n’ihe nile di n’ime ya siri malite. Onweghi ihe aka ngwere g’eme ukwu oji.  Onweghi ihe eze oke g’eme ite una. N’ihi nkea anyi ga ahukwa otu Chukwu siri gosi ndi Egypt nkari n’ihi ihunanya ya maka ndi Isreal. Nwanyi gbakere n’oria nwa ya nwuo, oka nokwa n’oria. Onye rerenkita zuta enwe, ihe ntukwu ka nokwa n’ulo ya. Nnunu si n’ala bere na mkpu n’ala ka o ka no. Ya mere Pol di aso n’ihe ogugu nke ga esi n’agba ohuru ga-ado anyi aka na nti, k’anyi ghota na akpogbukoro onwe anyi ochie na Kristi n’obe iji mee ka ahu anyi ghara idanyezi na njo; ka ewee gbaputa anyi n’ohu nke njo. Ahughi ebule, anaghi eli Dike. Mmonwu ejighi mbenukwu gba oto. Agucha ihe ogugu si n’ozi Pol di aso degara ndi Rom, onye Ukochukwu ga amalite nnukwu ukwe Alleluia nke anyi kwusiri mgbe anyi malitere Oge ncheta ahuhu Kristi (Lent).
Agwo turu mbe, oturu okpokoro ihe. Onweghi ihe oko ji n’eme mma. Onwu na ekwensu enweghi ike obula ebe Kristi no, maka na onye jide ofo nna ya ujo anaghi atu ya. Obu anu kara obi na-ebi n’ohia achara. O bu ya kpatara n’ozioma di aso nke Mark dere, a g’akowaputara anyi otu umunwayi gara ite ahu Jesu ude siri hu na Jesu onye Nazareth, nke akpogburu n’obe ekulie la. Ihe ha huru turu ha na anya mana otukpoghi ha anya. Agucha ozioma, Ukochukwu ga akowara anyi ihe omimi di n’emume abalia n’ihe na nwanyi bu uzo bia ije di n’enwe mpakari ite karia.
Ugbua, anyi ga amalitezi emume anyi n’uju.
HOLY MASS
NKEJI NKE ABUO: EMUME NKE OKWU
Okwu di kwuru kwuru, edebe onu kwuru kwuru wee kwuo ya. Ugbu a anyi g’emenyuzi oriona anyi nodu ala gee ukochukwu nti. Okwuchaa ihe oga agwa anyi, oburuzie oge ihe ogugu. Ya bu n’anyi nozi na agba nke abuo.
AFTER THE PRIEST’S BRIEF ADDRESS:
Umunna, o di mkpa ka m gwa unu na dika ntuzi aka nke “General Instruction on the Roman Missa” siri di, odighi nnukwu mkpa na aga enye nkowa tupu aguo ihe ogugu obula. Ya mere, anyi agaghi enye nkowa obula maka ihe ogugu ndi a nke ga adi ogologo na otutu n’ihi na otuturu uka adighi mma n’uka mgbede. Onye obula were nti ya nuru oru ebube Chukwu ruru nna nna anyi ha. K’anyi were kwazie ihe mmuta di na ha kporo ihe.
A gucha ihe ogugu nke obula na abu oma so ya, anyi nile ga akwuru oto maka nwa nke nke ekpere n’eso ihe ogugu n’ubochi taa. Agucha nke ano, aga amuyezi oku n’be nchu aja, Ukochukwu amalite ukwe otito diri Chineke n’elu kacha elu tupu ekpee ekpere mmeghe, guo ihe ogugu nke ise ga esi na agba, kwee Ukwe Alleluia ma guo ozioma.
BAPTISM
Umunnaa, e bugharia efere nri; anogharia onodu. Ntughari ntughari k’eji anya anwu.  O bu nwata n’ebugara nna ya oche n’ihu arusi n’amuta aha ana etu ndi mmuo. O bukwa so nwata n’ebutere ndi okenye oche na ama mgbe ha riri okuko agbara. Ya bu, anyi na abanyezi n’agba nke ato bu emume mmiri chukwu na ikweghari nkwa nke baptism. Unu mara n’obu sacramenti onye otu Kristi ga anatariri tupu onataba ndi ozo. O bu onye bara n’ohia ka ohia na-ezo. (In the absence of candidates for baptism, the renewal of baptismal vows takes place) Ugbua anyi nile ga amunye oriona anyi kwegharia nkwa Baptism anyi n’ihi na onye hapu ihe oji ama mma, mma ya aruo. Ekpere nke ndi kwerenu ga esote nkea ma emechaa.
OFFERTORY
Aka nri kwuo aka ekpe; aka ekpe akwuo aka nri. Chukwu emego nke ya site n’okike okere anyi, nye anyi ndu n’ihe eji acho ya mma, gbaghara anyi njo anyi nye anyi ndu ohuru ime Kristi bilitere n'onwu. Kunizienu bia kele ya maka n’etoo dike na nke omere ome ozo, onye na ako n’ubi chukwu ka chukwu n’ako n’ubi ya. Enyecha onyinye, abanye n’agba nke ano bu emume nke Eucharistia n’ihi na a chuchaa aja ma ahughi udele, mara n’ihe mere be ndi mmuo. O bu so ndi kwadoro onwe ha nke oma ga anata oriri nso mgbe oge ya ruru maka na  nwata kwocha aka ya nke oma, o soro ndi okenye rie ihe.
MMECHI (After Post Communion Prayer)
Umunna, nkata kpuru okpu oghoo ngiga. Anu gafee opi akpiri, uto ya agwu. Nwata rie ihe o na-amuru anya, ura eburu ya. Mmiri ju ite, anaghi abia ya aka. Onye na-ata akwu michaa onu, amara na mgbupu agubala ya. Osa no n’odu igu no na mmapu. Ndi b’anyi emume anyi g’abiazi n’isi njedebe ugbua. Ukochukwu kpechaa ekpere gozie anyi, anyi ewere onu naba n’ekwuputa otito Chukwu maka na okenye nokaria n’ulo, o rie nri edotere umuaka. Ma chetakwa ka idobe oriona gi tupu I puo.
Announce time for Easter Sunday Mass
Ubochi nta ka anyi chuo ya n’owere nchi.    
Compiled by Uwakwe Chibuike MFC
For St. Peter’s Seminary Okigwe, Imo State, April 4 2015
Acknowledgements: This commentary must have been influenced consciously and unconsciously by a number of other related works. I therefore thank and acknowledge all whose ideas influenced me in one way or the other in compiling this commentary.

No comments:

Post a Comment

DISCLAIMER: Comments, remarks and observations are allowed to enable my readers freely express their opinions concerning issues raised in this post. However, while I recommend the observance of the rule of courtesy for every comment, comments on this post do not in any way express my personal opinion. They are strictly the opinions of those who made the comments.

Print Friendly