Ndi b’anyi otito diri nu Jeso Kristi…
Umunne m na umunna m, ndi nze na ozo, ndi ichie, ndi
eze, ndi gburu agu na ndi n’egbughi, umuaka, umuagboghobia, umuikorobia, ndi
nne na ndi nna anyi nnoo-nu-oh!
Onye anwuna ma ibe ya efuna; onye mara nke ochiri ya
zaba; onye mara nke ana etu ya, ya zaa.
Na atufughi oge, n’ihi na o na-abu ekwe kuo ama
agbaa. Oge nri ehihie ruo, onye usa apuo oriri. O bu nani uzo di mma ka ana eje
ugboro abuo. Maka ndi uche ha echetaghi, ndi biara na ndi uzo biara, tata bu
TOOZIDEEH di aso, Ubochi Dinwenu Jeso Kristi guzobere Sakramenti nke Yukaristia
di Aso na Sakramenti nke odaasi di aso, bu nke eji echi ndi Ukochukwu. N’ubochi
taa kwa ka ogosiputara ihunaya n’ebe umu azu ya no site na isa ha ukwu.